Proverbs 3

Amamihe na-eweta ahụ ike

1Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị.
Ma debe iwu m nʼobi gị.
2Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ,
wetakwara gị udo na ọganihu.

3Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị,
kekwasị ha nʼolu gị,
deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
Ịsụgharị ya nʼụzọ ọzọ ga-abụ, deekwa ha nʼime obi gị 7:3; 2Kọ 3:3

4Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha
nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ.

5Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,
adaberekwala na nghọta gị.
6Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ,
ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.

7A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị.
Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
8Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike
gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.

9Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị,
na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị.
10Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke,
ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ.

11Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị,
ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya.
12Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba,
dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.

13Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe,
onye nwetara nghọta.
14Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha,
ọ bakwara uru karịa ọlaedo.
15Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi,
ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.
16Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya;
nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.
17Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma
bụrụkwa ụzọ udo.
18Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka,
e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma.

19Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa;
ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị.
20Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile,
igwe ojii na-atụdakwa igirigi.

21Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha:
amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke,
22nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ,
ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị.
23Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu
maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ.
24Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu,
ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.
25Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla
maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume.
26Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị,
ọ ga-echebekwa gị.

27Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ
mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.
28A sịkwala onye agbataobi gị laa,
bịaghachi azụ echi
mgbe i nwere ike ime ya taa.
29Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị,
nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ.
30Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi,
mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla.

31Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo
maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla.

32Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị,
ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma.
33Ọbụbụ ọnụ Onyenwe anyị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume,
ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume.
34Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo,
ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara.
35Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ,
ma ndị nzuzu na-enweta ihere.
Copyright information for IboBIU